Chineke Maara Ihe Niile
Chineke Maara Ihe Niile
Chineke ma ihe niile onye ọ bụla na-eme; Ọ mara echiche nke mmadụ na omume ya, ọ ga-aza ha otu a. Ọbụ abụ ahụ kọwara ihe Chineke ji mara ihe na ebe niile. Ọ sịrị,
"Jehova, I gwuputaworom obim. Gị onwe m maara ịnọdụ ala m na mgbe m biliri ọtọ; I ghọta uche m n’ebe dị anya. I ghọta uzọm na dinara ala m, are mara uzọ m nile. N'ihi na odighi okwu di n'ire m, ma lee, Jehova, I mara ya kpam kpam" (psalm 139: 1-4).
Ihe nkuzi:
Onye obula nke chere na ya ga - enwe ike izopu onwe ya n’ihu Chineke na-atu egwu. Onweghi onye puru izozo n’ebe Chineke no, ebe o no ebe nile, o makwara ihe nile ihe. N’ezie, anya Chineke na-ahụ nke ọma n’ebe ndị gbara ọchịchịrị, ọnụnọ ya dịkwa mkpa ebe mmadụ ọ bụla na-agaghị adị ndụ. Ebe obu Chineke bu ihe di ike otua, mmadu nile kwesiri itu egwu ma rubere ya isi. Onye ọ bụla kwesịrị ịmara anya nke Chineke tupu ya emee ihe ọ bụla. (Chineke ga - ekpe ikpe ma kwụọ ụgwọ ihe niile - ma ihe ọma ma ihe ọjọọ)!
Ekpere:
Ezigbo Chukwu, aghọtara m na ị na-ahụ ma mara ihe niile, na ị ga-ekpekwa ihe niile. Biko nyere m aka mee ka afọ ju m n'echiche m na omume m, ka m ghara imehie gị. Nye m amara ka afọ ju gị n'ihe niile m na-eme, ka m wee nwee ihe ịga nke ọma n’ala ndị dị ndụ. N’ihi n’aha Jizọs Kraịst ka m na-arịọ arịrịọ. Amen.
